“Ụwa ndị Igbo” nke Jindeogu Akụma-Kalụ (JAK) Njọkụ dere

Akwụkwọ à bụ ọhịa ogwu ya ga-amagbu ọkụkọ, mana mmadụ ga-aba n’ime ya sịrịrị-werere; ọ bụ mmiri riri ényí, mana á ga-egwu ya ègwù ka azụ asampete. Ọ bụ úgwú á rịkata, e zuo iké, mana a ga-arịcha ya ka Úgwú Udi dị n’ùkwùmba Enūgwu. Ọ bụ ọbaji Njọkụ; á na-eje, á na-eri ji. Ọ bụ udummiri Ígwékaàlà, mmiri anaghị akọ n’ime ya
Ụwandiigbo Amụtala “Ụwa ndị Igbo.”
M.O. ENE
Mgbe m nụrụ na Ticha Jindeogu Akụma-Kalụ (JAK) Njọkụ, óké ọkaammụta na ọkaankụzi n’Amaerika, na-ede akwụkwọ, óbì tọrọ m ụtọ nke ukwuu. O teele m rịọwara ya ka o dee ma bipụta ụfọdụ echiche ya na ihe ndị o mere, ọkachasị ka e siri bido ogige ugbo Igbo na Staunton, Virginia, USA. Ọ gaala afọ abụọ, anụkwaghị m maka akwụkwọ à. Ụjọ atụghị m maka na ihe njekoro na ọrịanje-19 mere n’afọ gara aga abụghị ihe e ji asụsụ Igbo agwa onye Panya.
Ijele ahụ á na-eche erutele Amaerika: “Ụwa ndị Igbo” nke Ticha J. Akụma-Kalụ Njọkụ dere. Akwụkwọ à nyere m óbì ụtọ. Ọ bụghị naanị na Ticha JAK dere akwụkwọ n’Igbo, nke sitere n’úgwú ruo na ndagwurugwu, site n’Oru ruo n’Igbo; ọ bụ maka na ọtụtụ ihe ọ rụtụrụ aka bụ ihe dị mkpa n’ụwa anyị bi n’ime ya: ụwa ndị Igbo.
Ihe niile JAK dere bụ ka o siri ghọta ha n’asụsụ Igbo. O kwesịrị ka a jaa ya mma, kelee ya ekele pụrụiche maka mbọ ọ gbara. O nwebeghi ọtụtụ akwụkwọ m hụrụ nwere ume ma kọwaa maka ọdịnala ọfụma n’asụsụ Igbo kemgbe Tony Ubesie dere “Ọdịnala Ndị Igbo” n’afọ 1978.
Onye sị na ihe na-atọ ụtọ, o kwuo ihe ọ na-atọ ka ya. Mụ kọwa maka ihe JAK dere n’Ụwa ndị Igbo,chi ga-eji, chi ga-abọ. Ndịnime ya kọwara maka Ndiigbo na igbo mkpa e ji mara ha, okike, amamihe, okwu dị mkpa, ime mma, udo, usoro e ji ebi ezi ndụ, akpaàlàokwu, abụ, mbem, uri, akụkọàlà, akụkọ ifo, akụkọ njem, égwú na egwuriegwu.
Nke tọrọ m iche bụ nkọwa maka “kwenu” (32-33). E kwuo maka “kwenu” ma a kpọghị m aha, ị mara na á ka na-ebi ọkwụrụ. Akọwara m maka “kwenu” kemgbe 1997, mana JAK ji asụsụ Igbo saa okwu ahụ, kọwamie ya ka o doo anya.
Kemgbe 1990-ga ka JAK dere na ama erika n’Amaerika, na ihe Igbo na-achọ bu ebe àlà dị mma, ebe àlà sara mbara, ebe Igbo ga-egbo mkpa. Ọ bụ ọkụ nnanna anyị ha gunyere anyi n’aka ka ọfọ. “Ọfọ dị, ogu dị. :::: [N]woke ji ọfọ, nwaanyị ji ọfọ, ma ọfọ mara onye ji ya.” O gosiri na “ọfọ na ogu ka Igbo ji aga; maka na ọfọ di ire bụ ọfọ ji ogu” (34-35). Na i nwereike ime ihe dị añaa apụtaghị na ị ga-eme ihe óbì gị anabataghị, ihe ga-emegide ibe. Mbanụ. Oolo. Waa!
Ọtụtụ akwụkwọ maka ọdịnala Igbo na-abụkarị na Bekee. Onye sụrụ gbagoo, ibe ya asụrụ gbada. Oge ụfọdụ, ihe ha na-akọ abụghịzị ihe ndiichie chere. Ọmụmaatụ, olee ka ‘ngọ’ – ihe ọ̀dị́màrà (symbol) kwesiri ịrịba ama n’alụmalụ— siri ghọọ “brideprice”? A na-ere nwaanyị ere n’àlà Igbo? Olee ka ‘ọgbụgbandụ ọjị’ (kolanut communion) siri ghọọ “breaking of kolanut”? Olee ka ‘ịgbankwụ’ (traditional wedding) siri ghọọ “wine-carrying”? Olee ka Ọdịnanị, nkwenye ndị Igbo gboo, si bụrụ “paganism”?
Akwụkwọ à na-egosikwe na ụzọ nkụzi agba ochie ka dịkwa ire n’ịkụziri ụmụakwụkwọ ugbu à. Akụkọ maka “Nwatakịrị Chọgara Ụta Ya Ọ Hapụrụ na-Nkume Iyi” (137-143) gosiri nke à. Atụmatụ à ga-adị mma iji kụzie atụrụakọ (logic) maọbụ echiche miriemi (critical thinking). Na nwatakịrị ma akwụkwọ si na ka e siri hazie ụbụrụ ya ka ọ na-aghọ nkọ. Ndiichie maara nke à nke ọma: Ndiigbo na akọ n’amamihe dị ka álá na óbì.
A nyụchaa ma a kapịghị ọnụ, ọ bụrụ òtòlò. Ihe e ji agụrụ akwụkwọ bu ka á na-amụta ihe na ka e si ede asụsụ… ka ọnụ na-aga ótù. Etu à ka ọ dị na Bekee, Chaịna, Fụrenchị, Jaman, nakwa Rọshịa. E nwere ụfọdụ ihe á ga-edezi na mbipụta ọzọ, tinyere ukookwu (index): “Onweghị onye Igbo ihe ọma na asọ nsọ” (17) gosipụtara ụzọ ihe abụọ na-enye nsogbu n’ide Igbo: ndepụ nnọchiaha (pronoun) na nsọpuru iwu odide ‘na.’ Ọzọ dị ka ibe ya, n’akwụkwọ e bipụtara na 2019, “Ndị Ulọ akwụkwọ Yunivasiti Ana Abọ” (52-53) kwesịrị ịbụ ‘Mahadum Ann Arbor.’
Onye hụrụ ugo jaa ugo mma; á naghị ahụ ugo kwadaa. O teele aka Ọkaa Ejike Eze (Omenka) na ndi Ụwandiigbo mịtawara ezi mkpụrụ n’ịhazi na n’ịkwalite asụsụ Igbo. Akwụkwọ JAK dere pụrụ iche maka na o weere aha ọgbakọ à gosi ụwa na Igbo na-egbo mkpa. Ọ na-enye obi añụrị na Ụwandiigbo, nke JAK so n’ime ya kemgbe ụtụtụ, amụtakwala nwa ọzọ nke á kpọrọ “Ụwa ndị Igbo.”
Akwụkwọ à ga-enye onye gụrụ ya ọtụtụ echiche maka ụwa anyị bi n’ime ya, site n’Igbo Anị (Bonny) gafeere Igboarịam na Igbo Etiti rue Igboeze, ma site n’Agbọ gafeee Asaba, Awka na Abakaliki wee ruo Abaomege … gara gafechee Alabekee ma rute Amaerika. Nke ka nke, onye chọọ isiokwu akwụkwọ ọ ga-ede n’Igbo, akwụkwọ à bụ ọbaokwu!
Akwụkwọ à bụ ọhịa ogwu ya ga-amagbu ọkụkọ, mana mmadụ ga-aba n’ime ya sịrịrị-werere; ọ bụ mmiri riri ényí, mana á ga-egwu ya ègwù ka azụ asampete. Ọ bụ úgwú á rịkata, e zuo iké, mana a ga-arịcha ya ka Úgwú Udi dị n’ùkwùmba Enūgwu. Ọ bụ ọbaji Njọkụ; á na-eje, á na-eri ji. Ọ bụ udummiri Ígwékaàlà, mmiri anaghị akọ n’ime ya.
Ticha JAK ataala ụkwa ma jaa ézé. Ọ gbaala ọbara ka iké ha ya. Nke fọdụzịrị dị anyị n’aka. Onye chọrọ kpọtụrụ @JAK ka e zitere ya akwụkwọ à mgbe ọ ka nwere ya. Naanị dọla iri na ise ($15) ka ọ ga-ewe iji zitere onyeọbụla bi n’Amaerika ótù akwụkwọ n’ime ótù izuụka.
Ọgwụ á gwọrọ ka o doo anya, á naghị etinye ya ose. Na nke à, obere ose ga-adị mma: Grab a copy of the book of the wise. For only $15, you will do your bit for the preservation and advancement of Igbo culture: language, traditions, arts, travels, religion, morality, ethics, etc. The book should grace the library of those who love the Igbo culture in all its rightful ramifications.
≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈≈
©M.O. Ene (MOE) bụ odee. Akwụkwọ Igbo ọhụrụ o dere nke ga-apụta n’ọnwa olemole na-abịa bụ iduuazị “Ikemba Ụmụmba.”