
Adaobi Chiọma Ịfụnanya Chineke bụ ada Amaeze n’Aladịmma, ala ndị na-asụ Igbo. Á mụrụ ya n’Amaerika. Ọ bụ nwa á mụrụ n’uju, uju akụ. O nwere nzere mmụta mahadum nke mbụ (BA) na nke abụọ n’azụmahịa (MBA), nwekwe nzere ọkaikpe (JD).
Ngwanụ, ka anyị chere, meghee ntị, na-agụ maka Ada Chiọma na ije.
(E dere ya na Bekee, mana e nwere olileanya na a ga-enwete onye ga na-atabịa iduaazị à n’odiniru!)
“CHIOMA CHINEKE: An American African Affair”
Kedu iduuazị ị gụrụ ikpeazụ? Iké agwụbeghị gị ịgụ nkátá ndọrọndọrọ ebighiebi? Gbado ya ụkwụ ebe ahụ: Nye ụvụrụ gị obere ohere. Gụọ ihe ga-ewetere obi gị ezumike pọlịna-pọlịna: iduuazị ọhụrụ nke Akụnna Madụeke na-ede. Izuụka ọbụla, ọ ga-ewepụta agba ọhụrụ nke gbadoro ụkwụ na ndu Chiọma Chineke na George Black nakwa n’ihe na-eme n’uwa anyi bi n’ime ya. Ya bụ, o nweghi onye ma (ọbụladị odee n‘onwe ya) ka akụkụ à ga-esi hazie maọbụ ka ọ ga-esi bie n’ótù afọ! Naanị ihe anyị ma ugbu à site n’osote isiedemede bụ na akụkọ gbasara Afụrịka na Amaerika. Ọbụladị naanị ka ị hụ ka nke à ga-esi gaa, biko soro sowe edeme à n’amasaịba www.aladimma.com/net/org
Ala dị mma, ọ bata onyeọbụla ọfụma; udo adị, ọganiru esochie.
ezi ọrụaka
ezi mmeso
ezi omume
ezi umeala