Ọnwa Ọdịbendị Igbo

ỌKWÁ DỊ MKPA

Á ga-enwe asọmpi akụkọ ederede mkpirisi (short story) n’Ọnwa Ọdịbendị Igbo nke afọ 2023. Nke à ga-adịrị naanị ụmụakwụkwọ sekọndịrị.

A ga-enyoche edemede na usoro ụtọasụsụ wee mara mbe abụọ nke bụ oké. Ọnụọgụ mkpụrụokwu akụkọ ederede ga-adị n’agbata 1500 na 2000.Etu à ka ihe nrite ga-edowe ihu:
Onye nke mbụ – N50,000
Onye nke abụọ – N30,000
Onye nke atọ – N10,000

Ụbọchị ikpeazụ izite edemede bụ Mee 30, 2023. Zite edemede gị tupu ụbọchị ahụ eruo. Ótù onyenkuzi ga-ebinyeriri aka nʻedemede iji gosi na ọ bụ nwaakwụkwọ sekọndịrị dere ya.

Edemede ọbụla ga-egosipụta ihe ndị à:

  1. Aha onye dere ya (odee)
  2. Ụlọakwụkọ odee na-aga nakwa obodo na steeti ọ dị
  3. Akara ekwentị odeeAha na akara ekwentị onyenkuzi odee
  4. Aha na ekwentị onyeisi ụlọakwụkwọ odee.

Zige ya n’akara ozi-ikuku (email) ndị à:
aladimma@gmail.com
admin@uwandiigbo.org

Biko, nyere aka tụsaa ozi à.
Igbo ga-adị: Ọdịnala anyị bụ ọganiru anyị.